Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 12:5 - Bible Nso

5 ka ndi-nchu-àjà were ya n'onwe-ha, nwoke ọ bula site n'aka onye ọ mara: ha onwe-ha gēme ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike, ebe ọ bula agāchọta ebe etipúru etipú.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ka onye nchụaja ọbụla site nʼaka otu nʼime ndị na-eche ego nara ego, a ga-eji mezie ihe ọbụla a chọpụtara na o mebiri nʼụlọnsọ ukwu ahụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 12:5
14 Iomraidhean Croise  

Ma nka bu ihe kpatara o ji welie aka-ya megide eze: Solomon wuru Milo, mechie ntipú obodo Devid, bú nna-ya.


nye kwa ndi nēdo nkume, nye kwa ndi nāwa nkume, na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo Jehova di ike, na ikwu ugwọ ihe nile nāputara ulo ahu ime ka ọ di ike.


Jehoash we si ndi-nchu-àjà, Ego nile nke ihe nsọ nile nke anēwebata n'ulo Jehova, bú ego onye nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, nwoke ọ bula ego madu nile nke ọ̀rùrù-ọnu-ya, na ego nile nke ọ batara n'obi nwoke ọ bula iwebata n'ulo Jehova,


O rue, n'arọ nke-orú-na-atọ nke eze, bú Jehoash, na ndi-nchu-àjà emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.


Rigokuru Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, ka o we guzù ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, nke ndi nēche nbata-uzọ chikọtaworo n'aka ndi Israel:


Ndi-isi ulo nke ndi bu nna, na ndi isi ebo Israel nile, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, ọbuná rue ndi-isi ije-ozi eze, we were afọ-ofufo nye onwe-ha.


Ndi Israel we ṅuria ọṅu, n'ihi na ha were afọ-ofufo nye onwe-ha, n'ihi na n'obi zuru okè ka ha were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ha: ọzọ kwa, Devid, bú eze, ṅuriri ọṅu uku.


O we chikọta ndi-nchu-àjà na ndi Livai, si ha, Puanu, jerue obodo nile nke Juda, chikọputa ego n'Israel nile ime ka ulo Chineke-unu di ike kwa-arọ, unu onwe-unu kwa, menu ngwa ime ihe ahu. Ma ndi Livai emeghi ngwa.


N'ihi na Atalaia, bú nwayi ahu nēmebi iwu, umu-ya ndikom tipúru ulo Chineke; ọzọ kwa, ha were ihe nsọ nile nke ulo Jehova nye Bealim.


Ihe a ka ha gēnye, onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, nkera shekel dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: (shekel bu orú gerah:) nkera shekel ahu bu àjà-nbuli anēbuliri Jehova.


Ndi gēsi n'aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e onye ọ bula gēmezu nkwa, dika okwu si di ka madu nile gāburu Jehova.


Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n'etiti madu na n'etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan