Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 11:2 - Bible Nso

2 Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 11:2
24 Iomraidhean Croise  

Hedad we b͕alaga, ya onwe-ya na ndikom Edom ufọdu n'etiti ndi-orù nna-ya tiyere ya, ibà n'Ijipt; ma Hedad bu nwa-okoro ntà.


O wue okpukpu-ulo n'aru ulo ahu nile, cubit ise ka idi-elu-ha di: ha we dabere n'ulo ahu n'osisi cedar.


Ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku nke-etiti di n'akuku aka-nri nke ulo ahu: ha we si n'uzọ-nrigo nke nāga buruburu nārigo n'ulo ntà nke-etiti, si kwa na nke-etiti je rue nke-atọ.


Jehoash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze.


O we nọ n'aka-ya n'ulo Jehova nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.


N'arọ nke-asa nke Jihu ka Jehoash malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.


Ma n'arọ nke-ise nke Joram nwa Ehab, bú eze Israel, mb͕e Jehoshafat bu kwa eze Juda, Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda, malitere ibu eze.


Ma Jehova ekweghi ibibi Juda, n'ihi Devid, bú orù-Ya, dika Ọ siri ya na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.


Joram nwa-ya, Ehazaia nwa-ya, Joash nwa-ya;


Ma Jehoshabeat, bú nwa-nwayi eze, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina. Jehoshabeat nwa-nwayi eze, bú Jehoram, nwunye Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, (n'ihi na nwayi ahu bu nwa-nne Ehazaia,) we zopu ya n'iru Atalaia, o we ghara ime ka ọ nwua.


osimiri Nail gēnuputa awọ, nke gārigo ba n'ulo-gi, na n'ime-ulo-ndina-gi, na n'elu ihe-ndina-gi, na n'ulo ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na n'ite-ọku-gi nile, na n'ihe-gi i ji agwọ achicha:


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Agaghi-ebipu n'ulo Devid onye nwe inọkwasi n'oche-eze ulo Israel;


ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.


ya bu na M'gāju nkpuru Jekob, na Devid, bú orùm, M'we ghara isi na nkpuru-ya were ndi ganāchi nkpuru nke Abraham na Aisak na Jekob: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ha.


Je n'ulo ndi Rikab, gwa ha okwu, me ka ha bata n'ulo Jehova, n'otù n'ime-ulo-ya, me ka ha ṅua manya-vine.


Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.


O we gwam okwu, si, Ime-ulo a, nke iru-ya di n'uzọ Ndida, diri ndi-nchu-àjà ahu, ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a.


O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan