Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 11:19 - Bible Nso

19 Ọ we chiri ndi-isi usu ọgu ndikom ise, na ndi-Karait, na ndi-ọb͕a-ọsọ, na ndi nile nke ala ahu; ha we me ka eze si n'ulo Jehova rida, ha we si uzọ ọnu-uzọ-ama ndi-ọb͕a-ọsọ ba n'ulo eze. O we nọkwasi n'oche ndi-eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 11:19
13 Iomraidhean Croise  

Ndi Midian we rerue ya Ijipt nye Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū.


Je bakwuru eze, bú Devid, si ya, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bughi gi onwe-gi ṅuru orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? ọ̀ bu kwa gini mere Adonaija ghọworo eze?


Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n'ọnọdu ha, nye ha n'aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya.


Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.


O we guzo ndi-ọnu-uzọ-ama n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo Jehova, ka onye ruru árú n'uzọ ọ bula we ghara ibà nime.


O we chiri ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi di ike nke-uku, na ndi nāchi achi n'etiti ndi Juda, na ndi nile nke ala ahu, me ka eze si n'ulo Jehova rida: ha we si n'etiti ọnu-uzọ-ama nke di n'elu ba n'ulo eze, me ka eze nọkwasi n'oche-eze nke ala-eze.


otù uzọ n'uzọ atọ gānọ kwa n'ulo eze, otù uzọ n'uzọ atọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n'ogige ulo Jehova nile.


ndi-eze na ndi-isi, ndi nānọkwasi n'oche-eze Devid, gābata kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a, bú ndi nānọkwasi n'ub͕ọ-ala na n'inyinya, ha onwe-ha, na ndi-isi-ha, ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem: obodo a gānọgide kwa rue mb͕e ebighi-ebi.


Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.


N'ihi na ọ buru na unu eme ihe a n'ezie, ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya gābata kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ulo a, bú ndi nānọkwasi n'ub͕ọ-ala na n'inyinya, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-ya.


Jisus we si ha, N'ezie asim unu, na unu onwe-unu ndi sorom, n'imu-ọzọ ahu, mb͕e ọ bula Nwa nke madu gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya, unu onwe-unu gānọkwasi kwa n'oche-eze iri na abua, nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.


Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n'ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan