Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 11:14 - Bible Nso

14 ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi, dika ikpé si di, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, kpọ, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi, dịka omenaala mmemme ịchị eze si dị. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze. Ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 11:14
17 Iomraidhean Croise  

Reuben we biaghachi n'olùlù ahu; ma, le, Josef anọghi n'olùlù ahu; ọ we dọwa uwe-ya nile.


Ha we dọwa uwe-nb͕okwasi-ha, onye ọ bula o bo inyinya-ibu-ya ibu, ha we laghachi n'obodo.


N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu.


Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise iwu, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti akuku; ma onye nābiaso ya n'azu, werenu mma-agha me ka ọ nwua: n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Ka aghara ime ka ọ nwua n'ulo Jehova.


Eze we guzo n'akuku ogidi, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a guzosie ike: ndi Juda nile we guzo n'ọb͕ub͕a-ndu ahu.


Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n'okpuru ya n'elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze.


Jehoram we chigharia aka-ya abua, b͕alaga, si Ehazaia, Aghughọ di, Ehazaia.


Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.


Eze we guzo n'ọnọdu-ya, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a.


Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri: Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.


Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n'uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n'ihi ọlu nile di ike nke ha hururi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan