Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 10:6 - Bible Nso

6 O we degara ha akwukwọ nke ub͕ò abua, si, Ọ buru na mu ka unu diri, ọ buru kwa na olum ka unu onwe-unu nēge nti, chirinu isi ndikom ahu, bú umu onye-nwe-unu, biakutem dika mb͕e a echi rue Jezreel. Ma umu eze, bú ọgu ndikom atọ na iri, nọ n'aka ndi uku obodo ahu, ndi nāzùlite ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mgbe ahụ, Jehu degaara ha akwụkwọ nke ugboro abụọ sị ha, “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu ga-erube isi nye m, chịrịnụ isi ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, bịakwute m nʼotu oge a echi na Jezril.” Nʼoge ahụ, ụmụ eze iri ndị ikom asaa nọ nʼaka ndịisi obodo ahụ, ndị na-azụlite ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 10:6
13 Iomraidhean Croise  

Onye nke bu onye-isi ulo, na onye nke bu onye-isi obodo, na ndi-okenye, na ndi nāzù umu eze, we zigara Jihu ozi, si, Ndi-orù-gi ka ayi bu, ayi gēme kwa ihe nile i si ayi me; ayi agaghi-eme nwoke ọ bula eze: gi me ihe di nma n'anya-gi.


O rue, mb͕e akwukwọ ahu bara ha n'aka, na ha chiri umu eze, b͕ue ha, bú ọgu ndikom atọ na iri, tiye isi-ha nime nkata, zigara ya rue Jezreel.


O rue, n'ututu, na ọ puru, guzo, si ndi Israel nile, Ndi ezi omume ka unu bu: le, mu onwem kekọtara madu imegide onye-nwem, b͕ue ya: ma ònye tib͕uru ndia nile?


Jihu we welie iru-ya le anya na window, si, Ònye diyerem? ònye? Onozi abua ma-ọbu atọ we leputa anya n'ebe ọ nọ.


Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya. Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.


Jehova we si Moses, Chiri ndi-isi nile nke ndim, kpọgidere ha Jehova n'iru anyanwu, ka idi-ọku nke iwe Jehova we si n'aru Israel laghachi.


Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.


Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan