Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 10:25 - Bible Nso

25 O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n'èzí, jerue obodo ulo Beal.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ngwangwa Jehu chụchasịrị aja nsure ọkụ, ọ pụrụ gwa ndị agha ya, na ndịisi ha okwu sị, “Baanụ nʼime ụlọ gbuo ndị niile nọ nʼebe ahụ. Unu ekwela ka otu onye nʼime ha gbapụ.” Ha jiri mma agha gbuo ndị ahụ nọ nʼime ụlọ Baal, tụpụta ozu ha nʼezi. Emesịa, ndị agha Jehu banyere nʼime ime ụlọ ebe ịchụ aja Baal,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 10:25
10 Iomraidhean Croise  

Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu.


Ndi nile nke ala ahu we ba n'ulo Beal, kwatue ya; ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha tupiara ha nke-ọma, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu. Onye-nchu-àjà we do ndi-nkekọta ilekọta ulo Jehova.


O b͕ue ndi-nchu-àjà nile nke ebe nile di elu nke di n'ebe ahu, n'elu ebe-ichu-àjà nile, o sure-kwa-ra ọkpukpu madu n'elu ha; o we laghachi na Jerusalem.


Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya.


Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Turunu, Nwoke ọ bula n'etiti unu, ya turu mma-agha-ya n'apata-ukwu-ya, gabiganu bia-ghachi kwa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'ọmuma-ulo-ikwū a nile, b͕u-kwa-nu, nwoke ọ bula, ya b͕ue nwa-nne-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue eyì-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue onye-aru-ya.


Eze we si ndi-ọb͕a-ọsọ ndi nēguzo n'akuku ya, Chigharianu, me ka ndi-nchu-àjà Jehova nwua; n'ihi na aka-ha di kwa n'akuku Devid, na n'ihi na ha mara na onye nāb͕apu ka ọ bu, ma ha ekpughepughi ntim ka m'nu ya. Ma ndi-orù eze ekweghi isetipu aka-ha idakwasi ndi-nchu-àjà Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan