Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 10:19 - Bible Nso

19 Ma ub͕u a, kpọnu ndi-amuma nile nke Beal, na ndi nile nēfè ya, na ndi-nchu-àjà-ya nile, ka ha biakutem; ka aghara ile anya nwoke ọ bula ma ahughi ya: n'ihi na enwerem àjà uku ichuru Beal; onye ọ bula elere anya ya ma ahughi ya, ọ gaghi-adi ndu. Ma Jihu mere ya n'aghughọ, ka o we me ka ndi nēfè Beal la n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 10:19
11 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a ziga, chikọtaram Israel nile rue ugwu Kamel, na ndi-amuma Beal, ndi di nnù madu na ọgu abua na iri, na ndi-amuma Ashera, ndi di nnù madu, ndi nēri ihe na table Jezebel.


Eze Israel we chikọta ndi-amuma, ra ka nnù ndikom, ọ si ha, M'gēje imegide Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu m'gārapu? Ha we si, Rigo; Onye-nwe-ayi gēnye kwa ya n'aka eze.


Jihu we chikọta ndi Israel nile, si ha, Ehab fère Beal òfùfè nke-ntà; Jihu gēfè ya òfùfè rinne.


Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.


Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume? Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?


Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọ Nāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.


Ma anamatu egwu, ma ọ nwere uzọ ọ bula agēmebi uche-unu ka unu pua n'afọ-ofufo na idi-ọcha nke di n'ebe Kraist nọ, dika agwọ ahu were aghughọ-ya ghọb͕ue Iv.


kama ayi juru ihe-nzuzo nile nke nēweta ihere, ayi adighi-ejeghari n'aghughọ, ayi adighi-emeso kwa okwu Chineke n'uzọ itu-ntu; kama ayi ji ngosi nke ezi-okwu nēme ka akọ-na-uche nke madu nile n'otù n'otù mara ayi n'iru Chineke.


N'ihi na aririọ ayi nāriọ unu esighi na njehie puta, o sighi kwa n'adighi-ọcha, ọ bughi kwa n'aghughọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan