Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 10:1 - Bible Nso

1 Ma Ehab nwere ọgu umu-ndikom atọ na iri nime Sameria. Jihu we de akwukwọ ziga na Sameria, zigara ndi-isi Jezreel, bú ndi-okenye, ziga-kwa-ra ndi nāzù umu Ehab, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ugbu a, e nwere ụmụ Ehab ndị ikom ọnụọgụgụ ha dị iri asaa ndị nọ na Sameria, Jehu dere akwụkwọ ozi ziga Sameria, zigara ndịisi obodo Jezril, zigakwara ndị okenye na ndị na-elekọta ụmụ Ehab ndị ahụ. Ọ sịrị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 10:1
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na okwu ahu aghaghi irè, bú nke ọ kpọrọ òkù n'okwu Jehova megide ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, megide kwa ulo nile nke ebe di elu nke di n'obodo nile nke Sameria.


Ọ zuru ugwu Sameria n'aka Shema na talent ọla-ọcha abua; o wue ulo n'ugwu ahu, kpọ aha obodo ahu o wuru Sameria, n'aha Shema, bú onye-nwe ugwu ahu.


Ọmri we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya na Sameria: Ehab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.


Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n'ala n'irum? n'ihi na o wedawo onwe-ya n'ala n'irum, M'gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n'ubọchi-ya: ọ bu n'ubọchi nwa-ya ka M'gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.


Ọ si nwayi-nwe-ya, Ọ gādim nọ̄ nma, ma asi na onye-nwem nọ n'iru onye-amuma nke nọ na Sameria! mb͕e ahu ọ gēme ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.


O we chọ Ehazaia, ha we jide ya, (ma onye ahu nēzo onwe-ya nime Sameria,) ha we me ka ọ biakute Jihu, me ka ọ nwua; ha we lìe ya, n'ihi na ha siri, Nwa Jehoshafat ka ọ bu, onye were obi-ya nile chọ Jehova. Ma ulo Ehazaia enweghi onye nwere ike ijide ala-eze.


Jehova we si ya, Kpọ aha-ya Jezreel; n'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, M'gēwere ọbara Jezreel leta ulo Jihu, M'gēme kwa ka ala-eze ulo Israel kwusi.


Ọ̀ bu mu onwem turu ime ndi nka nile? ọ̀ bu mu onwem muru ha, na I nāsim, Kuru ha n'obi-gi, dika nna-nāzù-nwa si eku nwa nāṅu ara, rue ala ahu nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha?


I gēmere onwe-gi ndi-ikpé na ndi-odozi-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, dika ebo-gi nile si di: ha gēkpe kwa ndi Israel ikpe ezi omume.


na Jesreel; na Jokdeam, na Zanoa;


Ọ nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ndi orú umu-inyinya-ibu na iri nēbu, ha nwe-kwa-ra orú obodo na iri, nke anākpọ Havot-jaia rue ta, nke di n'ala Gilead.


O nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom abua na orú umu umu na iri, ndi ọgu umu-inyinya-ibu atọ na iri nēbu: o we kpe Israel ikpe arọ asatọ.


Gideon nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom atọ na iri ndi siri n'úkwù onwe-ya puta: n'ihi na ọ nwere ọtutu ndinyom.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan