Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 1:9 - Bible Nso

9 O we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. O we gwa ya okwu, si, Gi onye nke Chineke, Eze asiwo, Ridata.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe ahụ, eze zigara otu onyeisi agha ya, na iri ndị agha ise ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha ahụ bịarutere hụ Ịlaịja ka ọ nọ ala nʼelu ugwu, onyeisi agha ahụ kpọrọ Ịlaịja sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo!’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 1:9
22 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n'ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi.


o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha.)


Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua.


Jezebel we zigara Elaija onye-ozi, si, Ka chi me otú a, ka ha me kwa ihe ọzọ otú a, ma asi na emeghm ndu-gi ka ọ di ka ndu otù onye nime ha dika mb͕e a echi.


Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.


O si n'ebe ahu jerue ugwu Kamel, si kwa n'ebe ahu laghachi na Sameria.


O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:


m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:


Amazaia we si Emos, Gi onye-ọhu-uzọ, je b͕alaga n'ala Juda, rie nri n'ebe ahu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēbu amuma:


N'ihi na Herod jidereri Jọn, we ke ya ab͕u, tiye ya n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya.


si, Buru ayi amuma, Kraist: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?


Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, nye kwa Ya amì n'aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n'iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju!


Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ,


Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.


Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha?


ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:


Ha we gosi Sọl, o we ziga ndi-ozi ọzọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Sọl we ziga kwa ndi-ozi ọzọ nke ub͕ò atọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan