Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 1:3 - Bible Nso

3 Ma mọ-ozi Jehova gwara Elaija, bú onye Tisbe, okwu, si, Bilie, rigo izute ndi-ozi eze Sameria, gwa ha okwu, si, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, na unu onwe-unu nēje iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja onye Tishbe okwu sị ya, “Gaa zute ndị ozi eze Sameria zipụrụ, jụọ ha sị, ‘Gịnị mere unu ji aga Ekrọn ịjụ ase? Ọ bụ na Chineke anọghị nʼIzrel mere unu ji aga ịjụ Baal-Zebub ase ịmata ma eze ọ ga-adị ndụ?’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 1:3
21 Iomraidhean Croise  

n'ihi na ha arapuwom, kpọ isi ala nye Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú chi Moab, nye kwa Milkom, bú chi umu Amon; ha ejeghi kwa ije n'uzọm nile, ime ihe ziri ezi n'anyam, na idebe ukpurum nile na ikpém nile, dika Devid, bú nna-ya, mere.


Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.


O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na okwu Jehova ruru Elaija nti, n'arọ nke-atọ, si, Je, me ka Ehab hu gi anya; M'gēnye kwa miri-ozuzo n'elu uwa.


O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n'Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n'okwu-Gi ka m'meworo ihe nile ndia.


O dina, raru ura n'okpuru otù osisi broom; ma, le, mọ-ozi nēmetu ya aka, si ya, Bilie, rie ihe.


Mọ-ozi nke Jehova we biaghachi nke ub͕ò abua, metu ya aka, si, Bilie, rie ihe; n'ihi na ije riri nne kari ike-gi.


Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,


Ehazaia we dapu n'ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m'gādiri ndu n'ọria nka.


Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.


Ha si ya, Ọ bu nwoke nwere aji nke-uku, eke-kwa-ra ya ihe-ọkiké akpukpọ n'úkwù-ya. Ọ si, Elaija onye Tisbe ka ọ bu.


O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.


O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel.


Onye amaworo na Juda ka Chineke bu: N'Israel ka aha-Ya di uku.


Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n'ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase?


Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama, Ebere-ha ka ha nārapu.


Ndi-ode-akwukwọ ndi si na Jerusalem ridata we si, O nwere Beelzebul; ha si kwa, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.


Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi gwara Filip okwu, si, Bilie, nāga n'akuku Ndida rue uzọ nke si na Jerusalem arida rue na Geza: uzọ ahu bu ọhia.


Ubọchi ta ka Jehova gēmechibido gi nye n'akam; m'gētib͕u kwa gi, wezuga isi-gi n'aru gi; m'gēwere kwa ozu ndi ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia nye anu-ufe nke elu-igwe, nye kwa anu-ọhia nke uwa ta; ka uwa nile we mara na Chineke diri Israel:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan