Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 1:2 - Bible Nso

2 Ehazaia we dapu n'ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m'gādiri ndu n'ọria nka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼoge a, Ahazaya sitere na mgbe ụlọ elu ya dị na Sameria daa, merụọ ahụ nke ukwuu. Nʼihi ọrịa a, o zigara ndị ozi, sị ha, “Gaa jụta ase nʼaka Baal-Zebub, bụ chi Ekrọn, ma m ga-adịrị site nʼihe mmerụ ahụ a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 1:2
25 Iomraidhean Croise  

n'ihi na ha arapuwom, kpọ isi ala nye Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú chi Moab, nye kwa Milkom, bú chi umu Amon; ha ejeghi kwa ije n'uzọm nile, ime ihe ziri ezi n'anyam, na idebe ukpurum nile na ikpém nile, dika Devid, bú nna-ya, mere.


Chiri kwa n'aka-gi ob͕e achicha iri, na achicha ntà, na karama manu-aṅu, jekuru ya: onye ahu gēgosi gi ihe gēme nwa-okoro.


Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam.


Ehab we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.


O we gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zigawo ndi-ozi iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase, ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel iju ase okwu-Ya? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.


Ma mọ-ozi Jehova gwara Elaija, bú onye Tisbe, okwu, si, Bilie, rigo izute ndi-ozi eze Sameria, gwa ha okwu, si, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, na unu onwe-unu nēje iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase?


Ha si ya, Otù nwoke rigotara izute ayi, ọ si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zìri unu, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel na gi onwe-gi nēziga iju Beal-zebub, bú chi Ekron, ase? n'ihi ya ihe-ndina ahu ebe i rigoworo, i gaghi-esi na ya rida, kama i ghaghi inwu.


Ha we rapu ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, ha we mere onwe-ha arusi awuru awu, bú umu-ehi abua, me kwa Ashera, kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè Beal òfùfè.


Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ, Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?


Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele: Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi, Ọ nēsi na window nile lebata anya, Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.


Ewe wusi mọ Ijipt n'etiti ya; ndum-ọdu-ya ka M'gēloda kwa: ha gāju kwa ihe-efu nile ha ase, ju kwa ndi-ntamu-ha, ju kwa ndi nāju mọ ihe, ju kwa ndi-dibia-afa.


N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka.


chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Eden, ndi nọ na Telasa?


ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì.


O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?


Ndi-ode-akwukwọ ndi si na Jerusalem ridata we si, O nwere Beelzebul; ha si kwa, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.


Ma ufọdu nime ha siri, N'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.


Ma otù okorọbia, aha-ya bu Yutikọs, nānọdu na window, onye oké ura nākwada; mb͕e Pọl nēkwu okwu rue oge dikari anya, ebe ura-ya kwadara ya o we si n'ulo elu nke-atọ di n'ulo ahu da n'ala, o mewo ozu mb͕e ha buliri ya.


ókè-ala ahu we pua rue akuku Ekron n'akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu rue Shikeron, o we gabiga rue ugwu Beala, we pua na Jabneel; ọpupu ókè-ala ahu di n'oké osimiri.


Ọ̀ bughi ihe Kemosh, bú chi-gi, nēme gi ka i nweta, ka i gēnweta? Ma onye ọ bula Jehova, bú Chineke - ayi, napuworo ala-ya n'iru ayi, nke ahu ka ayi gēnweta.


Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu, Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe, Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia? Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?


Ha we ziga ib͕e Chineke rue Ekron. O rue, mb͕e ib͕e Chineke biaruru Ekron, na ndi Ekron tiri nkpu, si, Ha eburuwo ib͕e Chineke Israel b͕a buruburu biakute ayi, ime ka ayi na ndi-ayi nwua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan