Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ndị Eze 1:12 - Bible Nso

12 Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m'bu, ka ọku si n'elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ịlaịja zara sị ya, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị agha ise gị na ha so.” Ngwangwa, ọkụ Chineke si nʼeluigwe daa rechapụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ndị Eze 1:12
6 Iomraidhean Croise  

Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n'ebe ahu miri dọrọ.


O we ziga-kwa-ra ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ọ za, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siworo, Ngwa ngwa, ridata.


Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi.


Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ọku nke Chineke esiwo n'elu-igwe da, rechapu ìgwe ewu na aturu, na ndi nējere gi ozi, ripia ha; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia ha, ha we nwua n'iru Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan