Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Jọn 1:12 - Bible Nso

12 Ebe m'nwere ọtutu ihe idegara unu n'akwukwọ, ezubeghm iwere akwukwọ na ink de ha: kama anamele anya na m'gābiaru unu aru, were kwa ọnu gwa unu okwu, ka ewe mezu ọṅù-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọ bụ ezie na enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na inki dee ha. Kama, ana m ele anya ịbịa leta unu ka mụ na unu kwukọrịta okwu ihu nʼihu, ka e sikwa otu a mee ka ọṅụ anyị zuo oke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Jọn 1:12
15 Iomraidhean Croise  

ọnu na ọnu ka M'gāgwa ya okwu ọbuná n'ile-anya, ọ bughi kwa n'ilu di iche iche; udi Jehova ka ọ gēlegide kwa anya: ọ̀ bu kwa gini mere unu nātughi egwu ikwu okwu megide orùm, bú imegide Moses?


Ihe ndia ka M'gwaworo unu, ka ọṅùm we di nime unu, ka ọṅù-unu we zu kwa.


Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a.


Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.


Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M'nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha.


Onye nwere nwunye ọhu bu onye nālu nwunye ọhu: ma enyì nke onye nālu nwunye ọhu, onye nēguzo nānu kwa okwu-ya, ọ nāṅuri ọṅu nke-uku n'ihi olu onye ahu nālu nwunye ọhu: ya mere emezuwo ọṅùm a.


mb͕e ọ bula m'gāga Spain (n'ihi na anamele anya na m'gēkiri unu mb͕e m'nāgabiga, anamele kwa anya na unu gēdupum n'ijem iga ebe ahu, ma ọ buru na afọ gēburu uzọ jum n'aru unu n'akuku ufọdu)


n'ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m'nēcheta anya-miri-gi nile, ka m'we juputa n'ọṅù;


Ma ọzọ kwa, dozi-kwa-ram ebe m'gānọ dika ọbìa: n'ihi na anamele anya na agēwerem nye unu n'amara site n'ekpere-unu.


Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari.


Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya.


ihe ndia ka ayi onwe-ayi nēde kwa n'akwukwọ, ka ewe mezue ọṅù-ayi.


N'ihi nka, ọ buru na abiam, m'gēme ka echeta ọlu-ya nile nke ọ nālu, n'iwere ajọ okwu nēkwugide ayi ihe-nzuzu: afọ ejughi kwa ya n'ihe ahu, ma ya onwe-ya adighi-anara umu-nna-ayi nke-ọma, ọ nēb͕ochi kwa ndi nēzube inara ha, ọ nāchupu kwa ha na nzukọ Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan