11 n'ihi na onye nāsi ya biri nke-ọma nēso ya n'inwekọ ọlu-ya nile, nke bu ajọ ọlu.
11 Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.
Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ, Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.
unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya;
Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.
N'ihi na onye ọ bula nke nēketa miri-ara bu onye akānwaghi ya n'okwu ezi omume; n'ihi na ọ bu nwa ọhu.
nāzọputa-kwa-nu ufọdu, nāguputa ha n'ọku; ma werenu egwu mere ufọdu ebere; nākpọ ọbuná uwe anu-aru nyeworo ntupọ asì.
M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile: