Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 9:7 - Bible Nso

7 Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 9:7
13 Iomraidhean Croise  

Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-i bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù-gi ndia bu, ndi nēguzo n'iru gi mb͕e nile, ndi nānu amam-ihe-gi.


Ma ekweghm okwu nile ha, rue mb͕e m'biara, anyam abua we hu ya: ma, le, egosighm nkera uba amam-ihe-gi: i tukwasiwo ihe n'akukọ nke m'nuru.


Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze-Ya, iburu Jehova, bú Chineke-gi, eze: n'ihi na Chineke-gi huru Israel n'anya, ime ka ha guzo rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.


Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.


Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu: Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.


Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.


N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha, Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.


Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:


Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu, N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi, Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.


Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.


Onye ahu nke nēkwu okwu bayere nna-ya, baye-kwa-ra nne-ya, si, Ahughm ya; Umu-nne-ya ka ọ nāmataghi kwa; Umu-ya ka ọ nāmaghi kwa; N'ihi na ha edebewo okwu-ọnu-Gi, Ọb͕ub͕a-ndu-Gi ka ha nēchezi kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan