Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 8:16 - Bible Nso

16 Ewe dozie ije-ozi nile nke Solomon rue ubọchi atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, ru kwa mb͕e ewubìri ya. Ewuzuru ulo Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 A rụzuru ọrụ niile Solomọn zubere ịrụ, site nʼụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị tutu ruo mgbe ewuchara ya. Ya mere, e wuchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 8:16
6 Iomraidhean Croise  

Ndi-owu-ulo nke Solomon na ndi-owu-ulo nke Hairam na ndi Gebal we, dozie osisi na nkume iwu ulo ahu.


N'arọ nke-anọ ka atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, n'ọnwa Ziv.


Ma n'arọ nke-iri-na-otù, n'ọnwa Bul, nke bu ọnwa nke-asatọ, ka ewusiri ulo ahu n'ihe-ya nile na n'ikpé-ya nile. O we nọ arọ asa n'iwu ya.


Ulo ahu, mb͕e anēwu ya, eji nkume nke awazuru awazu mb͕e ebutere ya wue ya: anughi kwa otùtù ma-ọbu anyu-ike ma-ọbu ihe-ọlu ọ bula nke ígwè n'ulo ahu, mb͕e anēwu ya.


Ma ha ewezugaghi onwe-ha n'ihe eze nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai n'iwu bayere ihe ọ bula, baye-kwa-ra àkù nile.


Mb͕e ahu Solomon jeruru Ezion-geba, ru kwa Ilot, n'usọ oké osimiri, n'ala Edom.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan