Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 8:13 - Bible Nso

13 ọbuná dika ihe ubọchi si di n'ubọchi-ya, n'isure àjà-nsure-ọku dika ihe Moses nyere n'iwu si di, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na na mb͕e nile akara àkà, ub͕ò atọ n'arọ, bú n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 ọbụladị dịka iwu metụtara aja e kwesiri ịchụ kwa ụbọchị si dị, bụ nke Mosis nyere nʼiwu. Aja ndị a bụ maka Ụbọchị Izuike, Ọnwa Ọhụrụ na ụdị mmemme atọ a na-eme nʼafọ, ndị bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme izu ụka asaa na mmemme ụlọ Ikwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 8:13
12 Iomraidhean Croise  

Ub͕ò atọ n'arọ ka Solomon surere àjà-nsure-ọku na àjà-udo nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà nke o wuru, o we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ tiyere ya n'elu ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova. O we wuzue ulo ahu.


Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a.


Nkpọkọta ahu nile nke ndi nālata site na ndọta-n'agha ahu mere ulo-ntu, we nọdu n'ulo-ntu-ha: n'ihi na umu Israel emeghi otú a site n'ubọchi Jeshua nwa Nun rue ubọchi ahu. Oké ọṅù di uku we di.


I gēme-kwa-ra onwe-gi ememe nke izù asa nke ubọchi asa, bú nke nkpuru mbu nke obìbì ọka wheat, na ememe nke nchikọta-ihe n'ọb͕ub͕a arọ.


Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Onye-nwe-unu Jehova, bú Chineke nke Israel.


Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n'ememe nile, na n'ọnwa ọhu nile, na n'ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha.


Ub͕ò atọ n'arọ ka agāhu ndikom-i nile n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa; n'ememe achicha ekoghi-eko, na n'ememe nke izù asa nke ubọchi asa, na n'ememe ulo-ntu: agaghi-ahu kwa ha n'iru Jehova n'aka efu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan