Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 8:12 - Bible Nso

12 Mb͕e ahu Solomon surere àjà-nsure-ọku nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, nke O wuru n'iru uzọ-nbata,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Emesịa, Solomọn chụrụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke o wuru nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu ahụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 8:12
8 Iomraidhean Croise  

na ndudu nile, na ọkwa-nwusa nile, na iko nile, nke ọla-edo anāgwaghi agwa: baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-edo nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula; baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-ọcha nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula:


Solomon we rigo n'ebe ahu rue ebe-ichu-àjà ọla n'iru Jehova, nke di n'ulo-ikwū nzute, o we sure nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri n'elu ya.


Ma mb͕e Esa nuru okwu ndia, na obubu-amuma nke Oded, bú onye-amuma, o mere onwe-ya ka ọ di ike, we me ka ihe-árú nile si n'ala Juda na Benjamin nile, si kwa n'obodo nile nke ọ naputara n'ugwu Efraim, gabiga; o me kwa ka ebe-ichu-àjà Jehova di ọhu, bú nke di n'iru uzọ-nbata Jehova.


O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ọla, orú cubit ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di kwa, cubit iri ka idi-elu-ya di kwa.


Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n'ememe nile, na n'ọnwa ọhu nile, na n'ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha.


O we me ka m'ba nime ogige di nime nke ulo Jehova, ma, le, n'ọnu-uzọ ulo uku nke Jehova, n'etiti uzọ-nbata na ebe-ichu-àjà, ka ihe ra ka orú ndikom na ise nọ, b͕akuta ulo uku nke Jehova azu-ha, che iru-ha n'akuku Iru-anyanwu; ndi ahu nākpọ kwa isi ala nye anyanwu che Iru-anyanwu iru.


Ka ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, kwa ákwá n'etiti uzọ-nbata-Ya na ebe-ichu-àjà-Ya, si, Jehova, mere ndi-Gi ebere, arara-kwa-la ihe-nketa-Gi nye n'ita-uta, Ka mba nile ọzọ we ghara ichi ha: n'ìhi gini ka ha gāsi n'etiti ndi nile dí iche iche, Òle ebe Chineke-ha nọ?


Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan