Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 7:9 - Bible Nso

9 Ha we me ememe nb͕ochi n'ubọchi nke-asatọ: n'ihi na ha mere ememe ira ebe-ichu-àjà nye Chineke ubọchi asa, me kwa ememe ahu ubọchi asa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nʼụbọchị nke asatọ, ha nwere ọgbakọ, nʼihi na ha mere mmemme nke ido ebe ịchụ aja nsọ nʼime ụbọchị asaa, meekwa mmemme ahụ abalị asaa ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 7:9
10 Iomraidhean Croise  

Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze, bú Solomon, n'ememe, n'ọnwa Etanim, nke ahu bu ọnwa nke-asa.


Solomon we me ememe na mb͕e ahu, ya na Israel nile, nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt, n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ubọchi asa na ubọchi asa, bú ubọchi iri na anọ.


Nkpọkọta ahu nile we nara idu-ọdu ime ememe ubọchi asa ọzọ: ha we were ọṅù me ememe ubọchi asa ọzọ.


N'ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n'ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.


O we nāgu n'akwukwọ iwu Chineke kwa-ubọchi, site n'ubọchi mbu rue ubọchi ikpe-azu. Ha we me ememe ahu ubọchi asa; ma n'ubọchi nke-asatọ ubọchi-nb͕ochi di, dika ikpé-ya si di.


Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.


Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n'ala n'ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova.


Ubọchi asa unu gēweta nso àjà-ọku ichuru Jehova: n'ubọchi nke-asatọ nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova: ubọchi nb͕ochi ka ọ bu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.


Ndi-isi we weta nso onyinye irara ebe-ichu-àjà nye Chineke n'ubochi etere ya manu, ndi-isi ahu we weta nso onyinye-ha iji biaru nso n'iru ebe-ichu-àjà.


Ubọchi isi ka i gēri achicha ekoghi-eko: n'ubọchi nke-asa ubọchi nb͕ochi gādiri Jehova, bú Chineke-gi; ejela ozi nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan