Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 7:5 - Bible Nso

5 Eze, bú Solomon, we chua àjà, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na ndi Israel nile we ra ulo Chineke nye Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Eze Solomọn chụrụ aja ehi nke dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri abụọ. Ya mere, Eze na ndị ahụ niile si otu a doo ụlọnsọ Chineke nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 7:5
16 Iomraidhean Croise  

Ha we chuara Jehova àjà, sure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku, n'echi ubọchi ahu, bú nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù ebulu abua na ọgu iri, na nnù umu-aturu abua na ọgu iri, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, ọbuná àjà n'uba bayere Israel nile;


Solomon we rigo n'ebe ahu rue ebe-ichu-àjà ọla n'iru Jehova, nke di n'ulo-ikwū nzute, o we sure nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri n'elu ya.


Ha we chuara Jehova àjà n'ubọchi ahu, site n'ihe-nkwata ha bubatara, bú nnù ehi na ọgu iri-na-ise, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri.


Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel.


N'ihi na Hezekaia, bú eze Juda, buliri nye nkpọkọta ahu nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri; ndi-isi buli-kwa-ra nye nkpọkọta ahu nnù oke ēhi abua na ọgu iri, na orú nnù aturu na nnù ise: ndi-nchu-àjà we do onwe-ha nsọ n'uba.


Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n'ebe ọ nọ, nọ n'iru ib͕e ahu, nāchu n'àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n'ihi iba-uba-ha.


Eze na ndi Israel nile nāchu kwa àjà n'iru Jehova.


Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa.


Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n'ememe nile, na n'ọnwa ọhu nile, na n'ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha.


Ọ̀ gātọ Jehova utọ, bú nnù kwuru nnù ebulu ma-ọbu orú nnù kwuru orú nnù iyi manu? #m'gēnye ọkparam n'ihi njehiem, nkpuru afọm n'ihi nmehie nkpuru-obim?


Ndi-isi we weta nso onyinye irara ebe-ichu-àjà nye Chineke n'ubochi etere ya manu, ndi-isi ahu we weta nso onyinye-ha iji biaru nso n'iru ebe-ichu-àjà.


Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan