Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 7:22 - Bible Nso

22 Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye mere ka ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka O meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ndị mmadụ ga-aza, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 7:22
10 Iomraidhean Croise  

O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.


M'gēkwu kwa okwu ikpem nile n'ebe ha nọ bayere ihe ọjọ ha nile; n'ihi na ha arapuwom, we surere chi ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, kpọ kwa isi ala nye ọlu di iche iche nke aka-ha.


I gāsi kwa ha, N'ihi na nna-unu-hà arapuwo Mu onwem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we jeso chi ọzọ di iche iche, fè ha, kpọ isi ala nye ha, ma Mu ka ha rapuru, ọ bu kwa iwum ka ha nēdebeghi;


Ma ọ buru na unu anughi okwu ndia, ejiwom Onwem ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na nkpọnkpọ ebe ka ulo a gāghọ.


Ha gākasi kwa unu obi, mb͕e unu nāhu uzọ-ha na omume nile ha: unu ewe mara na ọ bughi n'efu ka M'meworo ihe ahu nile nke M'meworo nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


O we me ka Okwu-Ya nile guzosie ike, bú nke O kwuru megide ayi, megide kwa ndi-ikpe-ayi ndi kpere ayi ikpe, n'ime ka ihe ọjọ uku biakwasi ayi: n'ihi na emeghi n'okpuru elu-igwe nile otú emeworo na Jerusalem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan