Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 7:14 - Bible Nso

14 ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 7:14
31 Iomraidhean Croise  

Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile.


Juda we chikọta onwe-ha ichọ iye-aka site n'aka Jehova: ọbuná site n'obodo nile nke Juda ka ha biara ichọsi Jehova ike.


Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n'ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa.


Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, bú ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, b͕aghara, nye nwoke ọ bula dika uzọ-ya nile si di, onye I mara obi-ya; (n'ihi na Gi onwe-gi amawo obi umu madu, nání Gi;)


Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke M'wuworo.


Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum; Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.


I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya: Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.


Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.


Ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu, n'otù ebe nke ala ọchichiri; asighm nkpuru Jekob, Chọnum n'ebe tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem bu Jehova, Onye nēkwu ezi omume, Onye nēgosi ihe di iche iche ziri ezi.


Otù onye-nb͕aputa gābiaru kwa Zaion, biakute ndi nēsi na njehie chigharia nime Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ayi aghọwo ndi I nāchighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi anākpọkwasighi ha aha-Gi.


N'ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n'etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi.


Le, M'gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n'aru ya, ya na ngwọta, M'gāgwọta kwa ha; M'gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu.


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), umu Israel gābia, ha onwe-ha na umu Juda n'otù; ha ganēje ije nākwa ákwá, ọ bu kwa Jehova, bú Chineke-ha, ka ha gāchọ.


Ayi gāgwọtawori Babilon, ma agwọtaghi ya: rapunu ya, ka ayi la, onye ọ bula n'ala-ya: n'ihi na ikpé-ya erutuwo elu-igwe, ebuliwo kwa ya rue mbara-ígwé.


Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n'ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n'aru ada ndim?


Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si umu ndim, Ezi omume nke onye ezi omume agaghi-anaputa ya anaputa n'ubọchi njehie-ya; ọzọ, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu, ọ gaghi-asu ngọngọ nime ya n'ubọchi o si na nmebi-iwu-ya chigharia: ọzọ kwa, onye ezi omume apughi idi ndu nime ya n'ubọchi o mehiere.


Ha gātukwasi kwa aham n'aru umu Israel; Mu onwem gāgọzi kwa ha.


Onye-nwe-ayi we si ya, Bilie, ga rue amá nke anākpọ Amá Eguzoziri, chọ kwa n'ulo Judas otù onye aha-ya bu Sọl, onye Tasọs: n'ihi na le, ọ nēkpe ekpere;


Ndi nile nke uwa gāhu kwa na ọ bu aha Jehova ka anākpọkwasi gi; ha gātu kwa egwu gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan