Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 6:26 - Bible Nso

26 Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe ebe a di, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 “Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 6:26
20 Iomraidhean Croise  

Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.


Asi na eb͕ochim elu-igwe, miri-ozuzo we ghara idi, ma-ọbu asi na enyem igurube iwu iripia ala, ma-ọbu asi na ezitem ajọ ọria nēfe efe n'etiti ndim;


Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya: Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.


m'gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m'gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri.


Nwa nke madu, mb͕e ala ọ bula nēmehie megidem n'imekpu ihe-nmekpu, M'we setipu akam imegide ya, b͕ajiere ya nkpa-n'aka, bú achicha, zite oké unwu nime ya, bipu madu na anumanu nime ya;


M'gāla, lata n'ọnọdum, rue mb͕e ikpe gāma ha, ha we chọ irum: n'ahuhu-ha ka ha gāchọsim ike.


M'egetiji nweli-elu nke ike-unu; M'gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla:


Ma n'ezie ka M'nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n'ala Israel n'ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n'ala ahu nile;


iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa.


Elu-igwe-gi nke di n'elu isi-gi gābu kwa ọla, ala nke di n'okpuru gi gābu kwa ígwè.


Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n'ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n'ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan