Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 6:16 - Bible Nso

16 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'iwum dika i jeghariworo n'irum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ dịka iwu m si dị nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu nʼocheeze Izrel nʼime ha.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 6:16
16 Iomraidhean Croise  

ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike nke O kwuru bayerem, si, Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n'irum n'ezi-okwu n'obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agaghi-ebipu n'ulo-gi onye nwe inọdu n'oche-eze Israel, ka O kwuru.


Ulo a nke gi onwe-gi nēwu, ọ buru na i jegharia n'ukpurum nile, ọ buru kwa na i me ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ buru kwa na i debe ihe nile M'nyere n'iwu ijeghari nime ha; M'gēme kwa ka okwum guzosie ike n'ebe i nọ, bú nke M'gwara Devid, bú nna-gi.


ọ̀ bughi ọlu-unu imara na Jehova, bú Chineke Israel, nyere Devid ala-eze ibu onye-isi Israel rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná ya na umu-ya, n'ọb͕ub͕a-ndu nnú?


Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.


Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n'ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid.


Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid.


Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, ọbuná ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;


M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi guzosie ike, dika Mu na Devid, bú nna-gi, b͕ara ndu, M'we si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'ichi Israel.


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova.


Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.


Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu; Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu: Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere.


Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndum Na ihe-àmàm nke M'gēzí ha, Umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi.


N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam; Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọzọ, nka ka M'gēkwe ka ulo Israel juam ase bayere ya, ka M'we mere ha ya; M'gēme ka ha ba uba na madu dika ìgwè ewu na aturu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan