Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 5:7 - Bible Nso

7 Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 5:7
13 Iomraidhean Croise  

Ub͕u a werenu obi-unu na nkpuru-obi-unu nye ichọ Jehova, bú Chineke-unu; bili-kwa-nu, wue ebe nsọ Jehova, bú Chineke, ibubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na ihe nsọ nile nke Chineke, n'ulo nke anēwuru aha Jehova.


Ọ si ndi Livai, bú ndi nēme Israel nile ka ha ghọta ihe, ndi di nsọ n'ebe Jehova nọ, Tiyenu ib͕e nsọ n'ulo ahu nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel, wuru; ibu agaghi-adiri unu n'ubu: ub͕u a fènu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-Ya, bú Israel, òfùfè.


na ihe-idọba-oriọna na oriọna nile ha, inwu enwu dika ikpé si di n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma;


Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi Livai we bulie ib͕e ahu.


Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n'ebe ọ nọ, nọ n'iru ib͕e ahu, nāchu n'àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n'ihi iba-uba-ha.


N'ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha n'elu ebe ib͕e ahu, cherubim ahu we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n'aka-ya abua n'elu.


dọba ib͕e ahu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na umu Israel b͕ara.


Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi; Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.


O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n'iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan