Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 5:2 - Bible Nso

2 Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiaru Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Mgbe ahụ, Solomọn kpọkọtara ndị okenye Izrel niile, na ndịisi ebo Izrel niile, na ndịisi ezinaụlọ Izrel niile na Jerusalem, maka ị site na Zayọn, bụ obodo Devid bugota igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 5:2
21 Iomraidhean Croise  

Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.


Ewe gosi eze, bú Devid, si, Jehova agọziwo ulo Obed-edom na ihe nile o nwere, n'ihi ib͕e Chineke. Devid we were ọṅu je, si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e Chineke n'obodo Devid.


Devid we mere onwe-ya ulo ufọdu n'obodo Devid; o we doziere ib͕e Chineke ọnọdu, we mara ya ulo-ikwū.


si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m'doziri nye ya.


Devid, na ndi-okenye Israel, na ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, we nēje iwere ọṅù si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova:


Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya.


Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Chineke.


Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.


Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama.


Shelomot nka na umu-nne-ya bu ndi-isi ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile nke Devid, bú eze, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na usu ọgu ndikom ise, na ndi-isi usu-ndi-agha, doro nsọ.


Devid we kpọkọta ndi-isi nile nke Israel, bú ndi-isi ebo nile, na ndi-isi òkè nile ndi nējere eze ozi, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-isi àkù na anu-ulo nile eze nwere, na nke umu-ya ndikom nwere, ha na ndi-onozi, na ndi-dike, ọbuná dike ọ bula nke bu dìnkpà, rue Jerusalem.


Ma Devid siri na Kiriat-jearim bugota ib͕e Chineke rue ọnọdu nke Devid doziri ya: n'ihi na ọ mara ulo-ikwū nye ya nime Jerusalem.


Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ; bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Chineke.


ọzọ, ndi Livai, bú ndi-ọbù-abù, ọbuná ha nile, bú Esaf na Himan, na Jedutun, na umu-ha ndikom, na umu-nne-ha, nēguzo kwa n'akuku ọwuwa-anyanwu nke ebe-ichu-àjà ahu, yiri ezi ákwà ọcha, chiri kwa ájà na une na ubọ-akwara, ọgu ndi-nchu-àjà isi ndi nāfù opi so-kwa-ra ha:)


Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike N'elu Zaion, bú ugwu nsọm.


Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion Kari ebe-obibi nile nke Jekob.


Ha we weta ihe Moses nyere n'iwu n'iru ulo-ikwū nzute: nzukọ Israel nile we biaru nso guzo kwa n'iru Jehova.


Ha we si n'ugwu Jehova bulie ije-ha je ije ubọchi atọ; ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova nēbuli kwa ije n'iru ha ije ubọchi atọ, ileputara ha ebe izu-ike


Ma mb͕e o zuru ike, ọ nāsi, Jehova, laghachikute ọtutu ìgwè madu ndia, bú usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan