Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 5:11 - Bible Nso

11 O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n'ebe nsọ puta, (n'ihi na ndi-nchu-àjà nile ahuru doro onwe-ha nsọ, ọ dighi onye ọ bula idebe ihe n'òkè n'òkè;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mgbe ndị nchụaja sitere nʼEbe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ pụta, nʼihi na ndị nchụaja ahụ niile doro onwe ha nsọ nʼagbanyeghị usuu nke onye ọbụla nʼime ha si pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 5:11
13 Iomraidhean Croise  

Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we do onwe-ha nsọ ibugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel.


Ha we chikọta umu-nne-ha ndikom, do onwe-ha nsọ, ba, dika ihe ahu si di nke eze nyere n'iwu, site n'okwu, ime ka ulo Jehova di ọcha.


Nání na ndi-nchu-àjà di ole-na-ole, ha apughi kwa ib͕a akpukpọ anu àjà-nsure-ọku nile: umu-nne-ha, bú ndi Livai, we me ka ha di ike, rue mb͕e ejebìri ozi ahu, ru kwa mb͕e ndi-nchu-àjà doro onwe-ha nsọ: n'ihi na ndi Livai nwere obi ziri ezi kari ndi-nchu-àjà ido onwe-ha nsọ.


si ha, Nurunum, ndi Livai; ub͕u a donu onwe-unu nsọ, do kwa ulo Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, nsọ, me ka idi na nsọ-unu pua n'ebe nsọ ahu.


Ha we b͕ue anu ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nke-abua: ma ihere mere ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ha we do onwe-ha nsọ, webata àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova.


Dozi-kwa-nu onwe-unu dika ulo nna-unu-hà si di n'òkè nile unu, dika odide-akwukwọ Devid, bú eze Israel, si di, na dika odide-akwukwọ Solomon nwa-ya si di.


B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di.


ọzọ, ndi Livai, bú ndi-ọbù-abù, ọbuná ha nile, bú Esaf na Himan, na Jedutun, na umu-ha ndikom, na umu-nne-ha, nēguzo kwa n'akuku ọwuwa-anyanwu nke ebe-ichu-àjà ahu, yiri ezi ákwà ọcha, chiri kwa ájà na une na ubọ-akwara, ọgu ndi-nchu-àjà isi ndi nāfù opi so-kwa-ra ha:)


O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.


Jehova we si Moses, Jekuru ndim, do ha nsọ ta na echi, ka ha su kwa uwe-nb͕okwasi-ha,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan