Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 5:10 - Bible Nso

10 Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses tiyere nime ha na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'Ijipt puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 5:10
14 Iomraidhean Croise  

dọba ib͕e ahu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na umu Israel b͕ara.


Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile:


Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.


O rue, mb͕e ọ biaruru ọmuma-ulo-ikwū ahu nso, na ọ huru nwa-ehi ahú na otite-egwú ahu: iwe Moses we di ọku, o we tupu mbadamba nkume ahu n'aka-ya, tupia ha n'okpuru ugwu ahu.


Jehova we si Moses, Wara onwe-gi mbadamba nkume abua dika nke-mbu: M'gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n'elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara.


O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu:


Ndia bu okwu ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu ka ya na umu Israel b͕a n'ala Moab, nāgughi ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Ya na ha b͕ara nime Horeb.


nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan