Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 4:3 - Bible Nso

3 Oyiyi ehi di kwa n'okpuru ya, ndi nọ ya buruburu buruburu, ha di cubit iri, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu. Ehi ahu di iri na abua, awuru mb͕e awuru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ụmụ oke ehi gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ehi ndị ahụ dị nʼahịrị abụọ. A wụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 4:3
8 Iomraidhean Croise  

O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di buruburu buruburu, cubit ise ka idi-elu-ya di; eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.


O nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime.


Ma oyiyi iru nile ha, iru madu ka ha nwere; iru ọdum ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-nri; iru ehi ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-ekpe; iru ugo ka ha anọ nwe-kwa-ra.


Ma iru anọ diri cherub ọ bula nime ha: otù iru bu iru cherub ahu, iru nke-abua bu iru madu, nke-atọ bu iru ọdum, nke-anọ bu iru ugo.


Unu gāb͕a obodo ahu buruburu, ndikom agha nile, nēje obodo ahu buruburu otù ub͕ò. Otú a ka i gēme ubọchi isi.


Ihe mbu ahu nke di ndu yiri ọdum, ihe nke-abua ahu nke di ndu yi-kwa-ra nwa-ehi, ihe nke-atọ ahu nke di ndu nwe-kwa-ra iru dika nke madu, ihe nke-anọ ahu nke di ndu yi-kwa-ra ugo nēfe efe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan