Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 4:22 - Bible Nso

22 na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma: ọnu-uzọ ulo ahu kwa, ibo-ọnu-uzọ ime-ime ya nile nke diri ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo ahu, bú ulo uku Chineke, bu ọla-edo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ọ kpụkwara ihe ịkpakepụ ọkụ niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji niile, na ihe ịgụ ọkụ niile, na ibo ọlaedo niile nke ụlọnsọ, ya bụ, ibo ọnụ ụzọ ime ime niile nke dịrị Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na ibo ndị dị nʼọnụ ụlọ ezumezu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 4:22
12 Iomraidhean Croise  

Ọ pia n'elu ha cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa: ọ were ọla-edo nke emere ka ọ dabà n'elu ihe eb͕uru eb͕ub͕u machita ha.


na iko nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na ihe-nkoye-ibo nile, ma nke diri ọnu-uzọ ime-ime ulo ahu, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, ma nke diri ọnu-uzọ ulo, bú ulo uku Chineke, ha bu ọla-edo.


Otú ọ di, emeghi iko ọla-ọcha, na ihe-ikpakepu-ọku, na ọkwa-nwusa, na opì, ihe ọla-edo ọ bula, ma-ọbu ihe ọla-ọcha, nye ulo Jehova, site n'ego nke anēwebata n'ulo Jehova:


Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.


na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo, nke ahu bu ọla-edo dizu nma;


Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ; bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Chineke.


Nkpa-ya nile na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile gābu ọla-edo anāgwaghi agwa.


I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me.


O me-kwa-ra oriọna-ya, ha di asa, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.


Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.


Ọ bu kwa ibo-ọnu-uzọ abua ka ọnu-uzọ ndia nwere n'otù n'otù, bú ibo-ọnu-uzọ abua nke nāga buruburu; ibo-ọnu-uzọ abua diri otù ọnu-uzọ, ibo-ọnu-uzọ abua di-kwa-ra ọnu-uzọ nke-ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan