Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 4:2 - Bible Nso

2 O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di buruburu buruburu, cubit ise ka idi-elu-ya di; eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe nke ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 4:2
10 Iomraidhean Croise  

Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.


Devid we si na Tibhat, si kwa na Kun, bú obodo Hedareza, chiri ọtutu ọla nke-uku, nke Solomon ji me oké osimiri ọla ahu, na ogidi nile, na ihe ọla nile.


Oyiyi ehi di kwa n'okpuru ya, ndi nọ ya buruburu buruburu, ha di cubit iri, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu. Ehi ahu di iri na abua, awuru mb͕e awuru ya.


O me-kwa-ra ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu, bú ite-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ihe-ya nile ka o ji ọla me.


O me-kwa-ra ite ọsisa-miri, ọ bu ọla, ukwu-ala-ya bu kwa ọla: ọ bu enyo nke ndinyom nēzukọ n'usu n'usu, ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ka o ji me ya.


N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú.


O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme,


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan