Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 4:19 - Bible Nso

19 Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Chineke, ebe-ichu-àjà ọla-edo kwa, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ha;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Chineke, ya bụ, ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, na tebul niile nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 4:19
21 Iomraidhean Croise  

O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri.


na ọla-edo n'ọtùtù bayere table nile achicha anēdo n'usoro, bú table ọ bula; ọla-ọcha kwa bayere table ọla-ọcha nile:


Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a.


Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem.


Ihe nile nke ulo Chineke, ihe uku na ihe ntà, na àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke eze na ndi-isi-ya; ihe ndia nile ka ọ chibatara na Babilon.


O me kwa table iri, dọba ha n'ulo uku Chineke, ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe. O me kwa ọgu ọkwa-nwusa ise nke ọla-edo.


Tutu ogologo arọ abua eruzue Mu onwem ganēbulata nēbe a ihe nile nke ulo Jehova, nke Nebukadneza, bú eze Babilon, siri n'ebe a bupu, we bubà ha na Babilon:


ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:


otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?


Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n'elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n'ekpere ndi nsọ nile nke di n'elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n'iru oche-eze ahu.


Mọ-ozi nke-isi we fùa opì, m'we nu otù olu nke si na mpi nke ebe-ichu-àjà ahu eji ọla-edo me puta, bú nke di n'iru Chineke,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan