2 Ihe E Mere 34:9 - Bible Nso9 Ha we biakute Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, nye ya ego ahu nke anēwebata n'ulo Chineke, nke ndi Livai, bú ndi nēche nbata-uzọ, chikọtara n'aka ndi Manase na Efraim, na n'aka ndi nile fọduru nke Israel, na n'aka Juda na Benjamin nile na ndi bi na Jerusalem. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem. Faic an caibideil |
Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.