Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 34:2 - Bible Nso

2 O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 34:2
15 Iomraidhean Croise  

we dowapu ala-eze n'ulo Devid, nye gi ya: ma i dighi ka orùm, bú Devid, onye debere ihe nile M'nyere n'iwu, o were obi-ya nile jesom, ime nání ihe ziri ezi n'anyam;


n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Esa we me ezi ihe nke zi-kwa-ra ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya:


Jehova we nọyere Jehoshafat, n'ihi na o jere ije n'uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim;


kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n'ihe nile O nyere n'iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere.


Ma n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze, mb͕e ya onwe-ya nọ na nwata, ọ malitere ichọ Chineke nke Devid nna-ya: n'arọ nke-iri-na-abua ka ọ malite-kwa-ra ime Juda na Jerusalem ka ha di ọcha pua n'ebe di elu nile, na Asherim, na arusi nile apiri api, na arusi nile awuru awu.


Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.


dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n'okwu ahu ha gēgosi gi, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.


ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n'ihe enyere n'iwu wezuga onwe-ya, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n'ala-eze-ya, ya onwe-ya na umu-ya, n'etiti Israel.


ma ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe n'okwu nile ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ijeso chi di iche iche ọzọ ifè ha òfùfè.


Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.


Di-kwa-nu ike nke-uku idebe na ime ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu Moses, ka unu ghara isi nime ya wezuga onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan