Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 33:2 - Bible Nso

2 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ nʼihu ndị Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 33:2
17 Iomraidhean Croise  

ha we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe ahu n'ebe nile di elu, dika mba ọzọ mere, bú ndi Jehova mere ka ha je biri n'ala ọzọ n'iru ha; ha me-kwa-ra ihe ọjọ di iche iche ikpasu Jehova iwe:


Ha we ju ukpuru-Ya nile, na ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na ndi bu nna-ha b͕ara, na ihe-àmà-Ya nile nke Ọ b͕ara ha; ha we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu, soro mba ọzọ ndi nọ ha buruburu, ndi Jehova nyere ha iwu bayere ha, ka ha ghara ime dika ha.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


Ma ha anugh: Manase we me ka ha sihie uzọ ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel.


Onye ahu sure-kwa-ra ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ nime ndagwurugwu nwa Hinom, sure kwa umu-ya n'ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere: Emon we chuara arusi nile apiri api, bú nke Manase nna-ya mere, àjà, we fè ha òfùfè.


Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem.


àyi gālaghachi kwa mebie ihe nile I nyere n'iwu, we ghọ ọgọ ndi ahu ndi nēme ihe-árú ndia? Ì gaghi-ewesa ayi iwe, rue mb͕e emere ka ayi gwusi, ndi fọduru ma-ọbu ndi-nb͕apu we ghara idi?


M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.


unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na n'ukpurum nile ka unu nējegharighi, ọ bu kwa ihe nile nke M'kpere n'ikpe ka unu nēmeghi, kama ọ bu dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo.


Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba nile n'iru gi, ebe i nābà nime inweta ha, i we nweta ha, biri n'ala-ha;


Emerela Jehova, bú Chineke-gi, otú a: n'ihi na ihe-árú nile nke Jehova, nke Ọ nākpọ asì, ka ha meworo chi-ha; n'ihi na ọbuná umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha nēsurere chi-ha n'ọku.


N'ihi na mba ndia, nke gi onwe-gi gēnweta, nēge nti ndi nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, na ndi nāju ase: ma gi onwe-gi, ọ bughi otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.


Mb͕e gi onwe-gi nābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, amutala ime dika ihe-árú nile nke mba ahu nile si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan