Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 32:3 - Bible Nso

3 o we me ndi-isi-ya na ndi-dike-ya ka ha dua ya ọdu, ib͕ochi miri nke isi-iyi nile nke di n'azu obodo; ha we yere ya aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Hezekaya mere ngwangwa kpọkọta ụmụ eze niile na ndịisi agha ya. Mgbe ha zukọtara, ha kpebiri iwuchi isi iyi ahụ niile na-esi nʼazụ obodo na-asọpụta. Ha mekwara otu a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 32:3
13 Iomraidhean Croise  

I nāsi, (ma ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu) Ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha. Ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum?


Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na otú o mere ọdọ-miri, na uzọ-miri, we me ka miri rubata n'obodo, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?


Eze we nara idu-ọdu, ya na ndi-isi-ya, na nkpọkọta Juda nile nime Jerusalem, ime ememe ngabiga n'ọnwa nke-abua.


Hezekaia we hu na Senakerib abiawo, che iru ibuso Jerusalem agha,


Hezekaia nka b͕ochi-kwa-ra isi-iyi miri Gaihon di n'elu, we me ka miri ahu rùdazie n'akuku Ọdida-anyanwu obodo Devid. Ihe nāga-kwa-ra Hezekaia nke-ọma n'ọlu-ya nile.


Ewe chikọta ndi di ọtutu, ha we b͕ochie isi-iyi nile, na miri-iyi ahu nke nērùsi ike n'etiti ala-ha, si, N'ìhi gini ka ndi-eze Asiria gābia, hu ọtutu miri?


Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh: Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.


Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.


N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha: Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.


Ònye tùputaworo ma-obu nke Jehova, ma-ọbu, dika onye-ndum-ọdu-Ya, nēme ka Ọ mara ihe?


Sere onwe-gi miri nke nnọchigide-n'agha, me ka ebe-gi nile ewusiri ike sie ike: ba n'urọ, zọta ájá, jide ihe eji akpu brick.


N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi? ma-ọbu ònye putara ibu onye Ya na ya nāb͕a izù?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan