2 Ihe E Mere 32:12 - Bible Nso12 Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n'iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n'elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ? Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 Ọ bụghị Hezekaya na onwe ya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, ‘Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼotu ebe ịchụ aja, chụọkwa aja nʼelu ya’? Faic an caibideil |
Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.