Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 32:12 - Bible Nso

12 Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n'iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n'elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọ bụghị Hezekaya na onwe ya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, ‘Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼotu ebe ịchụ aja, chụọkwa aja nʼelu ya’?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 32:12
14 Iomraidhean Croise  

Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Jehova: ebe-ichu-àjà ọla-edo, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ya, ọ bu ọla-edo:


Ma ọ buru na unu asim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu onye Hezekaia wezugara ebe nile Ya di elu na ebe-ichu-àjà-ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala nime Jerusalem?


Ya onwe-ya wezugara ebe nile di elu, titue ogidi nile, b͕utue Ashera: o tipia-kwa-ra agwọ ọla nke Moses mere; n'ihi na rue mb͕e ahu umu Israel nēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpọ ya Nehushtan.


Ha we bilie wezuga ebe-ichu-àjà nile nke di na Jerusalem, ha wezuga-kwa-ra ebe nile nke isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha we kpofue ha nime miri-iyi Kidron.


Ma mb͕e emere ka ihe a nile gwusia, Israel nile ndi ahuru n'ebe ahu puru jerue obodo nile nke Juda, titue ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, kwatu kwa ebe di elu nile na ebe-ichu-àjà nile, me ka ha pua na Juda na Benjamin nile, n'Efraim kwa na Manase, rue mb͕e emere ka ha gwusia. Umu Israel nile we laghachi, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, rue obodo-ha.


Hezekaia, ọ̀ dighi-akpali unu, ira unu nye ka unu nwua site n'oké unwu, site kwa n'akpiri-ikpọ-nku, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gānaputa ayi n'ọbu-aka eze Asiria?


Otú ọ di, ndi Juda nọ nāchu àjà n'ebe di elu nile, ma ọ bu nání nye Jehova, bú Chineke-ha.


O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ọla, orú cubit ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di kwa, cubit iri ka idi-elu-ya di kwa.


Ma ọ buru na i sim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu Onye Hezekaia wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan