2 Ihe E Mere 31:2 - Bible Nso2 Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n'ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a2 Hezekaya kenyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị nʼusoro ịrụ ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke ụbọchị niile, maka ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo, na inye ekele, na ito Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ama ebe obibi ya. Faic an caibideil |
Dika ikpé Devid, bú nna-ya, si di, o we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà bayere òfùfè-ha, na ndi Livai bayere ihe-ndebe nile ha, ito Chineke, na ije ozi n'iru ndi-nchu-àjà, ime ihe ubọchi n'ubọchi-ya: o guzo-kwa-ra ndi-ọnu-uzọ-ama n'òkè nile ha n'ọnu-uzọ-ama ọ bula: n'ihi na otú a ka ihe si di nke Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu.
agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.