Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 30:11 - Bible Nso

11 Otú ọ di, ndikom ufọdu ndi sitere n'Asha na Manase, site kwa na Zebulun, ruru ala, we bia Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 30:11
19 Iomraidhean Croise  

Ma ufọdu nime umu Juda, na ufọdu nime umu Benjamin, na ufọdu nime umu Efraim na Manase, biri na Jerusalem;


Site n'ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà.


Ma mb͕e o wedara onwe-ya n'ala, iwe Jehova siri n'aru ya chigharia, O we ghara ibibizu ya: ọzọ kwa, ezi ihe ufọdu di na Juda.


N'ihi na ọtutu ndi Israel, bú ọtutu ndi sitere n'Efraim na Manase na Isaka na Zebulun, emeghi onwe-ha ka ha di ọcha, kama ha riri oriri ngabiga otú anēdeghi ya n'akwụkwọ. Ma Hezekaia kpere ekpere bayere ha, si, Ka Jehova, bú ezi Onye ahu, kpuchiere onye ọ bula nmehie-ya,


Umu Israel ndi ahuru nime Jerusalem we me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa n'ọṅù uku: ndi Livai na ndi-nchu-àjà nēto kwa Jehova kwa-ubọchi, chiri ihe nādasi udà ike nēto Jehova.


Ha we ṅuria, bú nkpọkọta nile nke Juda, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na nkpọkọta nile ndi nēsi n'Israel bia, na ndi-ọbìa ndi nēsi n'ala Israel bia, ndi nēbi kwa na Juda.


Ma mbe anākpab͕u ya, ọ chọ ka iru Jehova, bú Chineke-ya, dajua, we ruru ala nke-uku n'iru Chineke nke nna-ya-hà.


Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n'akwukwọ okwu Hozai.


Ma o rurughi ala n'iru Jehova, dika Manase, bú nna-ya, ruru ala; kama Emon nka mere ka ikpe ma ya ri nne.


n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Chineke, mb͕e i nuru okwu-Ya nile megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, i we ruru ala n'irum, dọwa kwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm.


Ma gi onwe-gi, bú nwa-ya, Belshaza, i meghi ka obi-gi di ala, ọ bu ezie na i mara ihe a nile;


Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;


N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


Ma ndikom ufọdu rapara n'aru-ya, we kwere na Jisus: n'etiti ha Daiọnisiọs onye Areọpagọs di kwa, na otù nwanyi, aha-ya bu Damaris, ha na ndi ọzọ.


Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.


Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan