Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 30:1 - Bible Nso

1 Hezekaia we zigara Israel na Juda nile ozi, ọzọ kwa, o degara Efraim na Manase akwukwọ-ozi, ka ha biarue ulo Jehova nime Jerusalem, imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 30:1
17 Iomraidhean Croise  

N'ezie emeghi ememe ngabiga dika ememe ngabiga nka site n'ubọchi ndi-ikpe ndi kpere Israel, ọbuná ubọchi nile nke ndi-eze Israel, na nke ndi-eze Juda;


Ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi nọ n'Israel nile we si n'ókè-ala-ha nile guzo onwe-ha n'akuku ya.


Site n'ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà.


Ma onye nke Chineke biakutere ya, si, Eze, ka usu-ndi-agha Israel ghara iso gi bia; n'ihi na Jehova anọyeghi Israel, bú umu nile nke Efraim.


ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n'ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n'ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a.


Hezekaia we ṅuria, ya na ndi-ya nile, n'ihi ihe nke Chineke doziri nye ndi ahu: n'ihi na ọ bu na mberede ka ihe a mere.


Eze we nara idu-ọdu, ya na ndi-isi-ya, na nkpọkọta Juda nile nime Jerusalem, ime ememe ngabiga n'ọnwa nke-abua.


B͕u-kwa-nu anu ngabiga, do kwa onwe-unu nsọ, dozi-kwa-ra umu-nne-unu ihe, ime dika okwu Jehova, site n'aka Moses, si di.


Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:


M'gēsi aṅa rara gi nye, Efraim? M'gēsi aṅa nyebiga gi, Israel? M'gēsi aṅa me gi ka i di ka Adma? M'gēsi aṅa do gi ka Zeboim? obim ab͕aghariwo n'arum, obi-eberem nile di ọku n'otù.


Omume nile ha agaghi-ekwe ha ichighakute Chineke-ha: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile di nime ha, ọ bu kwa Jehova ka ha nāmaghi.


N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan