Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 28:9 - Bible Nso

9 Ma otù onye-amuma Jehova nọ n'ebe ahu, Oded bu aha-ya: ọ pua izute usu-ndi-agha ahu nke nābiaru Sameria, ọ si ha, Le, ọ bu n'ihi na Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, kosara Juda ọnuma, ka O nyere ha n'aka-unu, unu we were ọnuma nke ruru elu-igwe b͕ue ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 28:9
22 Iomraidhean Croise  

Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n'elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n'elu uwa nile.


Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala.


Ma, le, otù onye-amuma biaruru Ehab, bú eze Israel, nso, si, Otú a ka Jehova siri, Ì huwo oké ìgwè madu nile a? le, anamenye ya n'aka-gi ta; i gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.


Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n'ihi na n'ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi.


Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n'aka-gi, bú onye M'wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya.


Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko ka m'dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba nke-uku: ma ka m'ghara idabà n'aka madu.


Jehova, bú Chineke-ya, we nye ya n'aka eze Siria; ha we tib͕ue ya, si nime ndi-ya dọta ndọta-n'agha uku, me ka ha biarue Damaskọs. Ọzọ kwa, n'aka eze Israel ka enyere ya, o we tib͕ue ya oké ntib͕u.


M'we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n'ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n'ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe.


N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo; Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ.


Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M'we nye ha n'aka-gi: i nweghi obi-ebere n'aru ha; n'aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku.


Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n'ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n'irum.


Ọ bu kwa iwe uku ka Mu onwem nēwesa mba nile ndi nọ jū: n'ihi na Mu onwem were iwe nke-ntà, ma ha onwe-ha yere aka ime ha ihe ọjọ.


n'ihi na nmehie-ya nile rapakọrọ n'otù rue elu-igwe, Chineke cheta-kwa-ra ajọ omume-ya nile.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia; umu Israel we fè Kushan-rishataim òfùfè arọ asatọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan