Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 26:21 - Bible Nso

21 Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n'ihi na ebipuru ya n'ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 26:21
9 Iomraidhean Croise  

Ma ndikom anọ, bú ndi-ekpenta, nọ n'oghere ọnu-uzọ-ama: ha we sirita, onwe-ha, Gini mere ayi onwe-ayi nānọdu n'ebe a rue mb͕e ayi nwuru?


Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nile, we le ya anya, ma, le, ya onwe-ya bu onye-ekpenta n'egedege-iru-ya, ha we me ka ọ pua n'ebe ahu n'ima-jijiji;ọzọ kwa, ya onwe-ya mere ngwa ipu apu, n'ihi na Jehova etib͕uwo ya.


Orú arọ na ise ka Jotam b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok.


Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.


Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n'ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa.


Ewe mechibido Miriam uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: ma ndi Israel ebulighi ije rue mb͕e achikọtara Miriam na ndi Israel.


Umu Israel we me otú a, chupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū: dika Jehova gwara Moses okwu, otú a ka umu Israel mere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan