Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 26:20 - Bible Nso

20 Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nile, we le ya anya, ma, le, ya onwe-ya bu onye-ekpenta n'egedege-iru-ya, ha we me ka ọ pua n'ebe ahu n'ima-jijiji;ọzọ kwa, ya onwe-ya mere ngwa ipu apu, n'ihi na Jehova etib͕uwo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 26:20
8 Iomraidhean Croise  

Uzaia we wee iwe; ma ihe eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ di n'aka-ya isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ma mb͕e o nēkosa ndi-nchu-àjà ọnuma, ekpenta wara n'egedege-iru-ya, n'iru ndi-nchu-àjà n'ulo Jehova, n'akuku ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n'ihi na ebipuru ya n'ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe.


nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà:


Mọdekai we laghachi n'ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n'ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.


onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n'ihe-otutó ahu,


Mb͕e unu gābata n'ala Kenean, nke Mu onwem nēnye unu ka ọ buru ihe-onwunwe, M'we tiye ihe-otiti ekpenta n'ulo ọ bula nke ala ahu, bú ihe-onwunwe-unu;


Jehova gēwere ọtita-aru, were kwa aru-ọku, were kwa nruru-ọku, were kwa oké okpom-ọku, were kwa mma-agha, were kwa nchakpọ, were kwa ọmuma-ebù, tib͕ue gi; ha gāchu kwa gi rue mb͕e i gāla n'iyì.


Jehova gēwere ihe-otiti ọjọ, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya, tie gi n'ikperè-ukwu-gi abua na n'ogwe-ukwu-gi abua, site n'ọbu-ukwu-gi we rue opu-n'isi-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan