Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 26:15 - Bible Nso

15 O me kwa nime Jerusalem ihe-agha echèputara, bú nchèputa nke onye nēchèputa ihe, idi n'elu ulo-elu nile, na n'elu nkuku mb͕idi nile, iji b͕a àkú na nkume uku. Aha-ya we pua rue ebe di anya; n'ihi na eyere ya aka n'uzọ di ebube, rue mb͕e ọ di ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 26:15
9 Iomraidhean Croise  

bú nwa nke nwayi nke sitere n'umu-ndinyom Dan, ma nna-ya bu nwoke Taia, ọ bu onye mara ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na nkume, na n'osisi, na n'ogho ododo, na n'ogho anunu, na n'ezi ákwà ọcha, na n'ogho uhie; na ib͕u eb͕ub͕u ọ bula, na ichèputa ihe-nchèputa ọ bula: ka ewe nye ya ọnọdu n'etiti ndi-gi mara ihe, na ndi mara ihe nke onye-nwem, bú Devid nna-gi.


Ma ub͕u a ziterem otù nwoke mara ihe n'ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na n'ogho ododo na ogho uhie na ogho anunu, onye ma-kwa-ra iso ndi mara ihe, ndi nọ n'ebe m'nọ na Juda na nime Jerusalem, bú ndi Devid nnam doziri, b͕u eb͕ub͕u.


Uzaia we doziere ha, bú usu-ndi-agha nile, ọta, na ube, na okpu-agha, na uwe-agha, na ute, ọbuná rue nkume èbè.


Ma mb͕e ọ di ike, obi-ya di elu rue nbibi, o we mekpu emekpu megide Jehova, bú Chineke-ya; o we ba n'ulo uku Jehova isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla,


n'ihi nka, le, M'gaje ilu kwa oké ọlu ọzọ n'etiti ndi nka, bú oké ọlu na ọlu ebube: amam-ihe nke ndi-ha mara ihe gāla kwa n'iyì, nghọta nke ndi-nghọta-ha gēzobe kwa onwe-ya.


Hunu n'etiti mba nile, legide-kwa-nu, ka o ju kwa unu anya nke-uku nke-uku: n'ihi na ọlu ka M'nālu n'ubọchi-unu, nke unu nāgaghi-ekwe, mb͕e agākọrọ unu ya.


Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.


Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n'agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan