Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 26:10 - Bible Nso

10 O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n'ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n'ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n'ebe di ala ala, ma n'ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n'ugwu na nime Kamel; n'ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n'anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 26:10
13 Iomraidhean Croise  

I siri n'aka ndi-ozi-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu ime, rue akuku nile Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe-nnọdu-abali nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.


Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri.


Jehoshafat we nāga n'iru we di ike ri nne; o we wue nime Juda ulo uku na obodo nchikọbata-ihe.


O nwe-kwa-ra ije-ozi bara uba n'obodo Juda nile, na ndikom agha nime Jerusalem, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.


Uzaia nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu agha, ndi nāpukuru usu-ndi-agha n'usu n'usu, dika ọnu-ọgugu nke ngukọta-ha si di n'aka Jeiel, bú ode-akwukwọ, na Maaseia, bú odozi-okwu, n'okpuru aka Hananaia, otù onye nime ndi-isi eze.


O we mere onwe-ya obodo di iche iche, na ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'uba: n'ihi na Chineke nyere ya àkù bara uba nke-uku.


Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n'ike n'ala anāchi achi, ibobo anwula gi n'ihe ahu anēme: n'ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n'elu ha.


Ọ̀ bughi nwa mb͕e ntà fọduru, Lebanon ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia?


bú obodo nile nke ala ahu di lari, na Gilead nile, na Beshan nile, rue Saleka na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan.


Maon, na Kamel, na Zif, na Juta;


Samuel we bilie n'isi-ututu izute Sọl n'ututu; ewe gosi Samuel, si, Sọl biaruru Kamel, ma, le, ọ nēguzoro onwe-ya ihe-ncheta, o we je buruburu, gabiga, ridarue Gilgal.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan