Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 24:14 - Bible Nso

14 Mb͕e ha lubìri, ha we weta n'iru eze na Jehoiada ego fọduru, ha we were ya mere ulo Jehova ihe, bú ihe ozi, na isure àjà-nsure-ọku, na ngaji, na ihe ọla-edo na ọla-ọcha. Ha we nēsure àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova mb͕e nile ubọchi nile nke Jehoiada.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye Onyenwe anyị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 24:14
13 Iomraidhean Croise  

na iko nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na ihe-nkoye-ibo nile, ma nke diri ọnu-uzọ ime-ime ulo ahu, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, ma nke diri ọnu-uzọ ulo, bú ulo uku Chineke, ha bu ọla-edo.


Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.


Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.


na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n'ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n'iru Jehova:


Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a.


Ndi nēje ozi ahu we lua ọlu, ewe jezue ozi ahu n'aka-ha, ha we guzo ulo Chineke dika ọtùtù-ya si di, me ka o sie ike.


Jehoiada we ghọ agadi, ubọchi ndu-ya we ju ya afọ, o we nwua; ọgu arọ isi na iri ka ọ b͕ara mb͕e ọ nwuru.


Hezekaia we guzo òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, dika òkè nile ha si di, nwoke ọ bula dika òfùfè-ya si di, ma ndi-nchu-àjà ma ndi Livai, ichu àjà-nsure-ọku na àjà-udo, ije ozi, na ikele ekele, na ito Chineke n'ọnu-uzọ-ama nile nke ọmuma-ulo-ikwū Jehova.


gwa Moses okwu, si, Ndi Israel nēweta ọtutu ihe kari nke gēzuru òfùfè nke diri ozi ahu nke Jehova nyere iwu ka eje ya.


Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu, Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan