Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 23:18 - Bible Nso

18 Jehoiada we tiye nlekọta nile nke ulo Jehova n'aka ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi Devid kère n'òkè ibu ndi-isi ulo Jehova, isure àjà-nsure-ọku nile nke Jehova, dika edeworo ya n'iwu Moses, n'ọṅù, na n'ibù-abù, site n'aka Devid.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Mgbe ahụ, Jehoiada nyefere nlekọta nke ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị nʼaka ndị nchụaja bụ ndị Livayị, bụ ndị Devid nyere ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ nke Onyenwe anyị nʼime ụlọnsọ, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, nʼiji ọṅụ na ịbụ abụ dịka Devid nyere nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 23:18
13 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Devid siri, Jehova, bú Chineke Israel, emewo ka ndi-Ya zuru ike; Ọ nēbi kwa nime Jerusalem rue mb͕e ebighi-ebi:


O we guzo ndi Livai n'ulo Jehova, ndi chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, dika ihe ahu si di nke Devid, na Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke eze, na Netan, bú onye-amuma, nyere n'iwu: n'ihi na o sitere n'aka Jehova, bú ihe ahu enyere n'iwu, site n'aka ndi-amuma-Ya.


Hezekaia we si ka esure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà. Ma na mb͕e amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibù abù Jehova, na ifù opì nile, na ikpọ ihe nile bu ubọ nke Devid, bú eze Israel.


Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala.


Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we bilie gọzie ndi ahu: ewe nu olu-ha, ekpere-ha we biarue ebe-obibi-Ya di nsọ, rue elu-igwe.


O we guzo ndi-nchu-àjà n'ihe-ndebe nile ha, me ka ha di ike ifè òfùfè ulo Jehova.


Ha we bugota ib͕e ahu, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bugotara ha.


Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa.


ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan