Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 22:11 - Bible Nso

11 Ma Jehoshabeat, bú nwa-nwayi eze, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina. Jehoshabeat nwa-nwayi eze, bú Jehoram, nwunye Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, (n'ihi na nwayi ahu bu nwa-nne Ehazaia,) we zopu ya n'iru Atalaia, o we ghara ime ka ọ nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, kuuru Joash nwa Ahazaya zopu ya site nʼetiti ụmụ eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina. Nʼihi na Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, bụ nwanne Ahazaya, ma bụrụkwa nwunye Jehoiada onye nchụaja, ya mere o jiri zonarị Atalaya nwantakịrị ahụ, ka ọ ghara igbu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 22:11
14 Iomraidhean Croise  

Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma n'ihi Devid ka Jehova, bú Chineke-ya, nyere ya oriọna na Jerusalem, ime ka nwa-ya bilie n'ọnọdu ya, na ime ka Jerusalem guzo:


Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.


Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.


Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile la n'iyì, bú ndi nwe ala-eze ulo Juda.


O we nọ n'aka-ha n'ulo Chineke nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.


Ma n'arọ nke-asa Jehoiaba mere onwe-ya ka ọ di ike, o we chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, bú Azaraia nwa Jehoram, na Ishmael nwa Jehohanan, na Azaraia nwa Obed, na Maaseia nwa Adaia, na Elishafat nwa Zikri, me ka ya na ha b͕a ndu.


Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è.


N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi: I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù.


osimiri Nail gēnuputa awọ, nke gārigo ba n'ulo-gi, na n'ime-ulo-ndina-gi, na n'elu ihe-ndina-gi, na n'ulo ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na n'ite-ọku-gi nile, na n'ihe-gi i ji agwọ achicha:


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n'uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n'ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M'gēme N'ihi ndi-orùm, ka M'we ghara ibibi ha nile.


ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan