Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 21:2 - Bible Nso

2 O nwe-kwa-ra umu-nne-ndikom, bú umu Jehoshafat, aha-ha bu Azaraia, na Jehiel, na Zekaraia, na Azaraia, na Maikael, na Shefataia: ndia nile bu umu-ndikom Jehoshafat, bú eze Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 21:2
10 Iomraidhean Croise  

Ndi-isi Israel na eze we weda onwe-ha n'ala, si, Onye ezi omume ka Jehova bu.


Jehoram we bilie ibu onye-isi ala-eze nna-ya, o we me onwe-ya ka ọ di ike, were mma-agha b͕ue umu-nne-ya ndikom nile, ọzọ kwa, o b͕uru ufọdu nime ndi-isi Israel.


Ha we nāga buruburu nime Juda, chikọputa ndi Livai n'obodo nile nke Juda, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ha we biarue Jerusalem.


Ha we lìe ya n'obodo Devid n'etiti ndi-eze, n'ihi na o mere ezi ihe n'Israel, na n'ebe Chineke na ulo-Ya di.


O we chikọta ndi-nchu-àjà na ndi Livai, si ha, Puanu, jerue obodo nile nke Juda, chikọputa ego n'Israel nile ime ka ulo Chineke-unu di ike kwa-arọ, unu onwe-unu kwa, menu ngwa ime ihe ahu. Ma ndi Livai emeghi ngwa.


N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bú eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova.


O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ.


Ehaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo ahu, bú nime Jerusalem; ma ha ebubataghi ya n'ílì ndi-eze Israel: Hezekaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


Ma ihe nile Manase mere nke fọduru, na ekpere-ya o kpere Chineke-ya, na okwu nile nke ndi-ọhu-uzọ, bú ndi gwara ya okwu n'aha Jehova, bú Chineke Israel, le, edewo ha n'akwukwọ ihe ndi-eze Israel mere.


Emeghi kwa ememe ngabiga dika nka n'Israel site n'ubọchi Samuel, bú onye-amuma; ọ dighi kwa eze Israel ọ bula mere ememe ngabiga dika ememe ngabiga ahu nke Josaia mere, ya na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Juda na Israel nile ahuru n'ebe ahu, na ndi bi na Jerusalem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan