Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Ihe E Mere 21:13 - Bible Nso

13 kama i jewo ije n'uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Ihe E Mere 21:13
18 Iomraidhean Croise  

Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, me kwa ihe ọjọ kari ndi nile buru ya uzọ.


O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?


Onye ahu me-kwa-ra ebe di elu n'ugwu nile nke Juda, we me ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, ọ rafu-kwa-ra Juda.


le, Jehova nēti ihe-otiti uku n'etiti ndi-gi na n'etiti umu-gi, na n'etiti ndinyom-i, na n'etiti àkù-gi nile:


Jehoram we bilie ibu onye-isi ala-eze nna-ya, o we me onwe-ya ka ọ di ike, were mma-agha b͕ue umu-nne-ya ndikom nile, ọzọ kwa, o b͕uru ufọdu nime ndi-isi Israel.


O je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka ọ nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Ha we rapu ulo Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we fè Asherim na arusi òfùfè: iwe we dikwasi Juda na Jerusalem n'ikpe-ọmuma-ha nka.


ka gi na ndi bi n'ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya;


N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.


Ahuhu diri onye ji ọbara ewu obodo, onye ji kwa ajọ omume me ka obodo guzosie ike!


Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.


ọ bughi dika Ken si buru onye si n'ajọ onye ahu puta, we b͕ue nwa-nne-ya. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka o b͕uru ya? N'ihi na ọlu-ya jọrọ njọ, ma ọlu nke nwa-nne-ya ziri ezi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan